Aha onyonyo, Etu m si eji nri emepụta ihe e ji achọ mma – Victor Nwaeze

Etu m si eji nri emepụta ihe e ji achọ mma – Victor Nwaeze

Victor Nwaeze bụ onye ntoroọbịa ji akwa o jiri nri olulu garri mepụta n'aka ya Nkọwa foto, Etu m si eji nri emepụta ihe e ji achọ mma – Victor NwaezeEbe akụkọ a siOnye dere ya, Adline Okere, Ndị mere akụkọ a, Onyeisi Ntaakụkọ , Ebeg o si, Legọs, Onye dere ya, Michael Ilediagu , Ndị mere akụkọ a, Ntaakụkọ, Ebeg o si, Legọs na Onye dere ya, Donald Chika Wogu, Ndị mere akụkọ a, Ntaakụkọ Onyoonyo, Ebeg o si, Legọs

otu elekere gara aga

Nwa okoroọbịa bụ Victor Nwaeze bi n’Enugwu mepụtara akwa e ji adụ akpa ma nche mmiri, ọlantị na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma site n’ihe oriri.

Ahụrụ m ebe e ji nri mepụta akwa, mụ e jiri garri, mkpo akwa nakwa ihe ndị ọzọ emepụta akụrụngwa e ji achọ mma dịka ọla ntị na akwa.

Usoro m ji eji nri emepụta akwa

Nwaeze kọwara etu o si eji akpụ emepụta akwa.

O buru ụzọ na gị awụnye akpụ n’efere, wụọ ya mmiri, ma were ite mbara sie ya n’ọkụ obere oge.

Ka akpụ a nọ n’ọkụ, ọ na-awụ ya agba nakwa kemịkalụ ndị ọzọ mere ya bụ akpụ ji wee sitụ ike n’aka.

O mechara ghasaa ya n’efere mbara ka ọ gbakọọ.

Ọ bụghị mgbe mbụ ndị mmadụ jiri nri mepụta ihe e ji achọ mma.

Mana Nwaeze sị na ọ chọrọ iji usoro a, mara na e nwere ihe ọ ga-amụta makwa ji ya mee nke nwereike ịbara ya uru.